Jọn 6

Nʼihi nke a, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ, kwụsị iso ya.

John 6:66 (UKJV) From that time many of his disciples went back, and walked no more with him.

64Ma nʼetiti unu, ọ dị ụfọdụ na-ekwenyeghị.” Nʼihi na Jisọs maara site na mmalite ndị ahụ nʼime ha na-ekwenyeghị, matakwa onye ahụ nke ga-arara ya nye.

65Ọ sịrị, “Ọ bụ nke a mere m jiri gwa unu na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m enyeghị ya ike.”

66Nʼihi nke a, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ, kwụsị iso ya.

67Jisọs sịrị mmadụ iri na abụọ ahụ, “Unu chọkwara iso ha pụọ?”

68Saimọn Pita zara ya sị, “Onyenwe anyị, onye ka anyị ga-agakwuru? Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.