62Gịnị ka unu ga-ekwu ma ọ bụrụ na unu ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-arịgo ebe ọ nọrịị na mbụ.
63Ọ bụ Mmụọ ahụ na-enye ndụ; anụ ahụ abaghị uru ọbụla, okwu ndị m gwara unu bụ mmụọ bụrụkwa ndụ.
64Ma nʼetiti unu, ọ dị ụfọdụ na-ekwenyeghị.” Nʼihi na Jisọs maara site na mmalite ndị ahụ nʼime ha na-ekwenyeghị, matakwa onye ahụ nke ga-arara ya nye.
65Ọ sịrị, “Ọ bụ nke a mere m jiri gwa unu na o nweghị onye ọbụla nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m enyeghị ya ike.”
66Nʼihi nke a, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya laghachiri azụ, kwụsị iso ya.