1Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gagharịrị na Galili, ma ọ kpachapụrụ anya hapụ ịga Judịa nʼihi na ndị Juu na-achọ ụzọ igbu ya.
2Mmemme Ụlọ ikwu ndị Juu dị nso,
3ya mere, ụmụnne ya ndị nwoke sịrị ya, “Si nʼebe a pụọ, gaa Judịa, ka ndị na-eso ụzọ gị nwe ike ịhụ ọrụ ị na-arụ.
4Nʼihi na o nweghị onye ọbụla chọrọ ịbụ onye ọha mmadụ ma, nke na-eme ihe na nzuzo. Ebe ọ bụkwanụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ụwa onwe gị.”
5Nʼihi na ọ bụladị ụmụnne ya ekwenyeghị na ya.