30Mgbe ahụ ha chọrọ ijide ya, ma o nweghị onye ọbụla metụrụ ya aka nʼihi na oge ya erubeghị.
31Ma otu ọ dị, ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ kweere na ya. Ha sịrị, “Mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, ọ ga-arụ ọrụ ebube ọzọ karịrị ndị a nwoke a rụrụla?”
32Ndị Farisii nụrụ ka igwe mmadụ ahụ na-atamu ntamu nʼolu nta banyere ya. Mgbe ahụ ndịisi nchụaja na ndị Farisii zigara ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwuu ahụ ka ha gaa jide ya.
33Jisọs sịrị, “Naanị nwa oge ka mụ na unu ga-anọ, aga m alakwurukwa onye zitere m.
34Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m. Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru ya.”