Jọn 7

Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m. Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru ya.”

John 7:34 (UKJV) All of you shall seek me, and shall not find me: and where I am, thither all of you cannot come.

32Ndị Farisii nụrụ ka igwe mmadụ ahụ na-atamu ntamu nʼolu nta banyere ya. Mgbe ahụ ndịisi nchụaja na ndị Farisii zigara ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwuu ahụ ka ha gaa jide ya.

33Jisọs sịrị, “Naanị nwa oge ka mụ na unu ga-anọ, aga m alakwurukwa onye zitere m.

34Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m. Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru ya.”

35Ndị Juu sịrịtara onwe ha, “Olee ebe nwoke a chọrọ ịga anyị na-agaghị achọta ya? Ọ ga-eje ebe ndị nke anyị a chụsasịrị achụsasị bi nʼetiti ndị Griik, ka ọ ga kuziere ndị Griik ihe?

36Kedụ ụdị okwu bụ nke a ọ na-ekwu sị, ‘Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m,’ na ‘Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru’?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.