41Ndị ọzọ sịrị, “Ọ bụ Kraịst ahụ.” Ma ndị nke ọzọ sịkwara, “Nʼezie Kraịst ahụ, ọ ga-esi na Galili pụta?
42Ọ bụ na akwụkwọ nsọ ekwughị na Kraịst ga-esi nʼagbụrụ Devid pụta, na Betlehem bụ obodo Devid?”
43Ya mere nkewa dapụtara nʼetiti igwe mmadụ ahụ nʼihi ya.
44Ụfọdụ chọrọ ijide ya ma ọ dịghị onye ọbụla metụrụ ya aka.
45Mgbe ahụ, ndị nche ụlọnsọ ukwu lọghachiri nʼebe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nọ, ndị sịrị ha, “Gịnị mere unu akpụtaghị ya?”