4Nʼihi na o nweghị onye ọbụla chọrọ ịbụ onye ọha mmadụ ma, nke na-eme ihe na nzuzo. Ebe ọ bụkwanụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ụwa onwe gị.”
5Nʼihi na ọ bụladị ụmụnne ya ekwenyeghị na ya.
6Jisọs sịrị ha, “Oge nke m erubeghị, ma oge nke unu nọ nʼebe a mgbe niile.
7Ụwa enweghị ike ịkpọ unu asị, ma ọ kpọrọ m asị nʼihi na ana m agba ama megide ya nʼọrụ ya jọrọ njọ.
8Unu onwe unu gaanụ na mmemme ahụ, agaghị m aga mmemme a nʼihi na oge m erubeghị.”