9Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile nʼotu nʼotu, malite nʼonye okenye ha, sitere nʼebe ahụ pụọ. Nʼikpeazụ, ọ fọdụrụ naanị Jisọs na nwanyị ahụ, ebe o guzoro nʼihu ya.
10Jisọs guzoro ọtọ jụọ ya sị, “Nwanyị, oleekwanụ ha? Ọ dịghị onye mara gị ikpe?”
11Ọ sịrị, “O nweghị onye ọbụla Onyenwe anyị.” Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m amakwaghị gị ikpe: Gawa, kama emehiekwala ọzọ.”
12Ọzọ, Jisọs gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ụwa. Onye ọbụla na-eso m agaghị ejegharị nʼọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.”
13Ndị Farisii sịrị, “Ị na-agbara onwe gị ama! Ya mere ama ị na-agbara onwe gị abụghị ezie.”