23Ma ọ sịrị ha, “Unu si nʼala ma esi m nʼelu bịa. Unu bụkwa ndị ụwa, ma abụkwaghị m nke ụwa a.
24A sịrị m unu na unu ga-anwụ nʼime mmehie unu, naanị na unu kwenyere na mụ onwe m, bụ onye ahụ.”
25Ha jụrụ ya, “Onye ka ị bụ?” Jisọs zara sị ha, “Abụ m onye ahụ m gwara unu na m bụ na mbụ.
26E nwere m ọtụtụ ihe m ga-ekwu nʼikpe unu ikpe. Ma matanụ na onye ahụ zitere m bụ onye eziokwu. Nʼihi nke a, ihe niile m nụrụ site nʼọnụ ya ka m gwara ụwa.”
27Ọ bụ ihe banyere Nna ya ka ọ na-agwa ha, ma ha aghọtaghị ya.