21Ọzọ ọ gwara ha, “Aga m ahapụ unu, unu ga-achọ m, ma unu ga-anwụ nʼime mmehie unu. Ma unu apụghị ịbịa nʼebe m na-aga.”
22Nke a mere ka ndị Juu na-asị, “Ọ ga-egbu onwe ya? Ọ bụ ya mere o ji sị, ‘Ebe m na-aga unu apụghị ị bịa’?”
23Ma ọ sịrị ha, “Unu si nʼala ma esi m nʼelu bịa. Unu bụkwa ndị ụwa, ma abụkwaghị m nke ụwa a.
24A sịrị m unu na unu ga-anwụ nʼime mmehie unu, naanị na unu kwenyere na mụ onwe m, bụ onye ahụ.”
25Ha jụrụ ya, “Onye ka ị bụ?” Jisọs zara sị ha, “Abụ m onye ahụ m gwara unu na m bụ na mbụ.