35Ohu enwekwaghị ọnọdụ mgbe ọbụla nʼezinaụlọ, ma ọkpara nwere ọnọdụ ruo ebighị ebi.
36Ya mere, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu nʼezie, unu ga-abụ ndị nwere onwe unu.
37Ama m na unu bụ ụmụ ụmụ Ebraham, ma unu na-achọ igbu m nʼihi na okwu m enweghị ọnọdụ nʼime unu.
38Ana m ekwu ihe m hụrụ nʼebe Nna m nọ, ma unu na-eme ihe unu nụrụ site nʼaka nna unu.”
39Ha zara ya, “Ebraham bụ nna anyị.” Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Ebraham, unu gara na-arụ ọrụ Ebraham rụrụ.