34Jisọs zara ha, “Nʼezie, nʼezie asị m unu, onye ọbụla na-eme mmehie bụ ohu mmehie.
35Ohu enwekwaghị ọnọdụ mgbe ọbụla nʼezinaụlọ, ma ọkpara nwere ọnọdụ ruo ebighị ebi.
36Ya mere, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu nʼezie, unu ga-abụ ndị nwere onwe unu.
37Ama m na unu bụ ụmụ ụmụ Ebraham, ma unu na-achọ igbu m nʼihi na okwu m enweghị ọnọdụ nʼime unu.
38Ana m ekwu ihe m hụrụ nʼebe Nna m nọ, ma unu na-eme ihe unu nụrụ site nʼaka nna unu.”