3Ndị ozizi iwu na ndị Farisii dọkpụtara otu nwanyị ha jidere nʼịkwa iko. Ha mere ka o guzo nʼihu igwe mmadụ ahụ niile.
4Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị jidere nwanyị a ka ọ na-akwa iko.
5Nʼiwu, Mosis nyere anyị ikike ka e jiri okwute tugbuo onye mere ihe dị otu a. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?”
6Ha kwuru nke a iji nwalee ya, iji nweta ihe ha ga-eji ebo ya ebubo. Ma Jisọs hulatara ala were mkpịsịaka ya dee ihe nʼala.
7Mgbe ha nọgidere na-ajụ ya ajụjụ, o biliri sị ha, “Onye ọbụla nʼime unu na-emebeghị mmehie ọbụla, ya buru ụzọ tụọ ya nkume.”