Jọn 8

Ndị ozizi iwu na ndị Farisii dọkpụtara otu nwanyị ha jidere nʼịkwa iko. Ha mere ka o guzo nʼihu igwe mmadụ ahụ niile.

John 8:3 (UKJV) And the scribes and Pharisees brought unto him a woman taken in adultery; and when they had set her in the midst,

1Ma Jisọs rigooro nʼUgwu Oliv.

2Nʼisi ụtụtụ echi ya, ọ bịara ọzọ nʼụlọnsọ ukwuu ebe ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya. Ọ nọdụrụ ala malite ikuziri ha ihe.

3Ndị ozizi iwu na ndị Farisii dọkpụtara otu nwanyị ha jidere nʼịkwa iko. Ha mere ka o guzo nʼihu igwe mmadụ ahụ niile.

4Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị jidere nwanyị a ka ọ na-akwa iko.

5Nʼiwu, Mosis nyere anyị ikike ka e jiri okwute tugbuo onye mere ihe dị otu a. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.