50Anaghị m achọ otuto nke onwe m, kama ọ dị onye nke na-achọ ya. Ọ bụkwa ya bụ onye ikpe.
51Nʼezie, nʼezie, agwa unu, onye ọbụla na-edebe okwu m agaghị anwụ ọzọ.”
52Mgbe ahụ ndị Juu sịrị ya, “Anyị maara ugbu a na mmụọ ọjọọ bi nʼime gị. Ebraham nwụrụ anwụ ya na ndị amụma, ma gị onwe gị na-asị na onye ọbụla kwere na gị agaghị anwụ ruo mgbe ebighị ebi.
53Ị dị ukwuu karịa nna anyị Ebraham? Ọ nwụrụ, ma ndị amụma nwụkwara. Onye ka ị na-eche na ị bụ?”
54Jisọs zara, “Ọ bụrụ na m etoo onwe m, otuto m bụ ihe efu, Nna m, onye unu na-asị na ọ bụ Chineke unu, bụ onye na-eto m.