53Ị dị ukwuu karịa nna anyị Ebraham? Ọ nwụrụ, ma ndị amụma nwụkwara. Onye ka ị na-eche na ị bụ?”
54Jisọs zara, “Ọ bụrụ na m etoo onwe m, otuto m bụ ihe efu, Nna m, onye unu na-asị na ọ bụ Chineke unu, bụ onye na-eto m.
55Amaara m onye ọ bụ nʼagbanyeghị na unu amaghị ya. Aga m abụ onye ụgha ma ọ bụrụ na m ga-asị na-amaghị m onye ọ bụ. Amaara m ya na-edebekwa okwu ya.
56Nna unu Ebraham ṅụrịrị ọṅụ mgbe o chetara na ọ ga-ahụ ụbọchị m; ọ hụrụ ya ma ṅụrịakwa ọnụ.”
57Ndị Juu sịrị ya, “Ị gbabeghị iri afọ ise ma ị hụla Ebraham?”