Jọn 9

Ya mere, ha sịrị nwoke ahụ kpuru ìsì, “Gịnị ka i nwere ikwu banyere ya? Ọ bụ anya gị ka o meghere.” Ọ sịrị, “Ọ bụ onye amụma.”

John 9:17 (UKJV) They say unto the blind man again, What says you of him, that he has opened yours eyes? He said, He is a prophet.

15Ya mere, ndị Farisii jụrụ ya otu o si bido ịhụ ụzọ. Ọ sịrị ha, “Ọ gwakọtara aja tee m nʼanya, a sakwara m ihu ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.”

16Ụfọdụ ndị Farisii sịrị, “Nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ bịa, nʼihi na ọ dịghị edebe ụbọchị izuike.” Ma ndị ọzọ na-asị, “Olee otu onye mmehie ga-esi rụọ ọrụ ịrịbama ndị dị otu a?” Nkewa dịrị nʼetiti ha.

17Ya mere, ha sịrị nwoke ahụ kpuru ìsì, “Gịnị ka i nwere ikwu banyere ya? Ọ bụ anya gị ka o meghere.” Ọ sịrị, “Ọ bụ onye amụma.”

18Ma ndị Juu ahụ ekweghị na nwoke a bụ onye kpuru ìsì na mbụ, nke e mere ka ọ hụ ụzọ, tutu ruo mgbe ha kpọrọ ndị mụrụ ya.

19Ha jụrụ ha sị, “Onye a ọ bụ nwa unu, onye unu na-asị na o kpuru ìsì site nʼoge a mụrụ ya? O si aṅaa ahụ ụzọ ugbu a?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.