17Ya mere, ha sịrị nwoke ahụ kpuru ìsì, “Gịnị ka i nwere ikwu banyere ya? Ọ bụ anya gị ka o meghere.” Ọ sịrị, “Ọ bụ onye amụma.”
18Ma ndị Juu ahụ ekweghị na nwoke a bụ onye kpuru ìsì na mbụ, nke e mere ka ọ hụ ụzọ, tutu ruo mgbe ha kpọrọ ndị mụrụ ya.
19Ha jụrụ ha sị, “Onye a ọ bụ nwa unu, onye unu na-asị na o kpuru ìsì site nʼoge a mụrụ ya? O si aṅaa ahụ ụzọ ugbu a?”
20Ndị mụrụ ya zara, “nke a bụ nwa anyị. Anyị matakwara na o kpuru ìsì site nʼoge anyị mụrụ ya.
21Ma otu o si ahụ ụzọ ugbu a maọbụ onye meghere anya ya, anyị amaghị. Jụọnụ ya. Ọ bụ dimkpa, ya zara ọnụ ya.”