29Anyị mara na Chineke gwara Mosis okwu, ma gbasara nwoke a, anyị amaghị ebe o siri bịa.”
30Nwoke ahụ zaghachiri sị ha, “Ma otu ọ dị, nke a bụ ihe ịtụnanya! Unu amaghị ebe o sịrị bịa ma o meghere anya m.
31Anyị mara na Chineke adịghị ege ndị mmehie ntị, ma ọ na-ege ntị onye na-atụ egwu ya na onye na-eme uche ya.
32Site na mgbe e kere ụwa, ọ dịbeghị onye a nụrụ na o meghere anya onye kpuru ìsì.
33Ọ bụrụ na nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ, ọ gaghị enwe ike ime ihe ọbụla.”