31Anyị mara na Chineke adịghị ege ndị mmehie ntị, ma ọ na-ege ntị onye na-atụ egwu ya na onye na-eme uche ya.
32Site na mgbe e kere ụwa, ọ dịbeghị onye a nụrụ na o meghere anya onye kpuru ìsì.
33Ọ bụrụ na nwoke a esiteghị nʼebe Chineke nọ, ọ gaghị enwe ike ime ihe ọbụla.”
34Ha zara sị ya, “Gị onye a mụrụ nʼime mmehie, ị na-achọ ikuziri anyị ihe?” Ha chụpụrụ ya nʼezi.
35Jisọs nụrụ na ha achụpụla ya nʼezi, ma mgbe ọ chọtara ya, ọ sịrị ya, “I kweere na Nwa nke Mmadụ?”