5Mgbe ahụ, ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ ahụ tụrụ oke egwu, malite itiku chi ha. Ha malitekwara itufu ihe niile dị nʼụgbọ mmiri ahụ, ime ka ụgbọ ahụ dị mfe. Ma nʼoge ihe ndị a na-eme, Jona nọrịị nʼala ala ụgbọ mmiri ahụ ebe o dinara ala na-arahụ ụra.
6Onyeisi ụgbọ jekwuru Jona sị ya, “Gịnị ka ị nọ nʼebe a na-eme, ị na-arahụ ụra? Bilie, kpọkuo chi gị, ma eleghị anya o nwere ike ileta anyị anya, meere anyị ebere, zọpụta anyị.”
7Mgbe ahụ, ndị nọ nʼụgbọ sịrịtara ibe ha, “Bịanụ ka anyị fee nza mata onye ihe ọjọọ dị otu a sị nʼaka ya bịakwasị anyị.” Ya mere, ha fere nza, nza ahụ a maa Jona.
8Nʼihi ya, ha sịrị ya, “Gwa anyị, onye mere ka ihe dị otu a bịakwasị anyị. Gịnị bụ ọrụ gị? Ebee ka i si bịa? Ị bụ onye obodo ebee? Ole agbụrụ i si na ya pụta?”
9Ọ sịrị, “Abụ m onye Hibru, na onye na-akpọ isiala nye Onyenwe anyị, bụ Chineke nke eluigwe, onye kere osimiri na ala akọrọ.”