7Mgbe ahụ, ndị nọ nʼụgbọ sịrịtara ibe ha, “Bịanụ ka anyị fee nza mata onye ihe ọjọọ dị otu a sị nʼaka ya bịakwasị anyị.” Ya mere, ha fere nza, nza ahụ a maa Jona.
8Nʼihi ya, ha sịrị ya, “Gwa anyị, onye mere ka ihe dị otu a bịakwasị anyị. Gịnị bụ ọrụ gị? Ebee ka i si bịa? Ị bụ onye obodo ebee? Ole agbụrụ i si na ya pụta?”
9Ọ sịrị, “Abụ m onye Hibru, na onye na-akpọ isiala nye Onyenwe anyị, bụ Chineke nke eluigwe, onye kere osimiri na ala akọrọ.”
10Egwu dị ukwuu tụrụ ụmụ nwoke ahụ, ha sịrị ya, “Gịnị ka i mere?” Nʼihi na ha matara na o si nʼihu Onyenwe anyị na-agbapụ ọsọ, nʼihi na ọ gwala ha rịị na ọ bụ otu o si dị.
11Ma ebili mmiri ahụ gara nʼihu na-amali nʼike nʼike. Nʼihi ya, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme gị, nke ga-eme ka osimiri dajụọ?”