1Mgbe Mosis, bụ odibo Onyenwe anyị nwụrụ, Onyenwe anyị gwara Joshua nwa Nun, onye na-enyere Mosis aka okwu sị,
2“Mosis, odibo m anwụọla. Ugbu a, jikere onwe gị, meekwa ka ndị m jikere ịgafe ofe ọzọ nke osimiri Jọdan, ịbanye nʼala ahụ m na-aga inye ha, bụ ndị Izrel.
3Ana m agwa gị ihe m gwara Mosis mgbe ọ dị ndụ sị, Ebe ọbụla unu ga-azọkwasị ụkwụ unu nʼala, ala ahụ ga-abụ nke unu.
4Oke ala unu ga-abụ site nʼọzara dị na ndịda ruo Lebanọn, ma site nʼiyi ukwu Yufretis, tinyere ala niile nke ndị Het, ruo nʼosimiri ukwu ahụ dị nʼọdịda anyanwụ.