7“Naanị dịrị ike, nweekwa ume. Lezie anya ime ihe niile Mosis bụ odibo m nyere gị nʼiwu. Ewezugala onwe gị na ya gaa aka nri maọbụ aka ekpe, ka ihe si otu a gaara gị nke ọma nʼebe ọbụla ị na-aga.
8Esitela nʼọnụ gị wezuga ihe dị nʼAkwụkwọ Iwu a. Kama na-atụgharị uche gị na ya ehihie na abalị, ka i si otu a lezie anya imezu ihe niile e dere nʼime ya. Mgbe ahụ ị ga-aba ụba, ihe ga-agakwara gị nke ọma.
9Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga.”
10Mgbe ahụ, Joshua nyere ndịisi Izrel niile iwu sị ha,
11“Jegharịanụ nʼetiti ebe obibi ụmụ Izrel gwa mmadụ niile okwu sị ha ‘Dozierenụ onwe unu ihe unu ga-eri nʼụzọ, nʼihi na nʼime ụbọchị atọ, anyị ga-agafe osimiri Jọdan, imeri na inweta ala ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke na-enye unu.’ ”