1Mgbe Adoni-Zedek, eze Jerusalem nụrụ na Joshua emeriela Ai, laa ya nʼiyi, gbukwaa eze ya, dịka ọ lara Jeriko na eze ya nʼiyi, mgbe ọ hụkwara na ndị Gibiọn na ndị Izrel emeela udo, na ha bikwa nso ndị Izrel,
2ọ tụrụ egwu nke ukwuu, ya na ndị ya. Nʼihi na Gibiọn bụ obodo a ma ama, dịka otu nʼime obodo ndị eze, ndị ikom ya bụkwa ndị dị ike, nʼihi na ọ dịkwa ukwuu karịa Ai. Ndị ikom ya niile maara otu e si ebu agha.
3Ya mere, Adoni-Zedek, eze Jerusalem ziri ozi zigara eze ndị a: Homa, eze Hebrọn, Piram, eze Jamut, Jafia, eze Lakish, na Debịa, eze Eglọn, na-asị,
4“Bịanụ nyere m aka, ka anyị gaa tigbuo Gibiọn, nʼihi na ha na Joshua na ụmụ Izrel emeela udo.”