Joshua 11

Ya mere, Joshua meriri ala ahụ niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu. O nyekwara ndị Izrel ala ahụ dịka ihe nketa ha. O kenyere ha ala ahụ dịka ebo ha si dị. Site nʼoge ahụ gaa nʼihu, ala ahụ dara jụụ. Ibu agha adịghịkwa nʼime ya ọzọ.

Joshua 11:23 (UKJV) So Joshua took the whole land, according to all that the LORD said unto Moses; and Joshua gave it for an inheritance unto Israel according to their divisions by their tribes. And the land rested from war.

21Nʼoge ahụ kwa, Joshua gara kpochapụ ndị Anak ahụ bi nʼala ugwu ugwu, ya bụ, na Hebrọn, na Debịa, na Anab, na ala ugwu ugwu Juda, na ala ugwu ugwu Izrel. O gburu ha niile, laa obodo ha nʼiyi.

22Ọ dịkwaghị otu onye Anak a hapụrụ ndụ nʼoke ala Izrel niile, karịakwa ndị fọdụrụ na Gaza, na Gat, na nʼime Ashdọd.

23Ya mere, Joshua meriri ala ahụ niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu. O nyekwara ndị Izrel ala ahụ dịka ihe nketa ha. O kenyere ha ala ahụ dịka ebo ha si dị. Site nʼoge ahụ gaa nʼihu, ala ahụ dara jụụ. Ibu agha adịghịkwa nʼime ya ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.