Joshua 11

Ya mere, Joshua na ndị agha ya niile bịaruru akụkụ mmiri Merọm na mberede, lụso ha agha.

Joshua 11:7 (UKJV) So Joshua came, and all the people of war with him, against them by the waters of Merom suddenly; and they fell upon them.

5Eze ndị a niile zukọrọ maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri Merọm, maka ibuso Izrel agha.

6Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Atụla ha egwu, nʼihi na echi, nʼoge dịka ugbu a, aga m ewere ha niile nʼọnọdụ ndị egburu egbu nyefee ha nʼaka Izrel. Ị ga-ebipụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, kpọọkwa ụgbọ agha ha niile ọkụ.”

7Ya mere, Joshua na ndị agha ya niile bịaruru akụkụ mmiri Merọm na mberede, lụso ha agha.

8Onyenwe anyị nyefere ndị agha ha nʼaka ndị Izrel, ndị lụgburu ha, chụọ ha ọsọ ruo nʼoke ala Saịdọn, ruokwa ebe a na-akpọ Mizrefot Maim, na ruo nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼime Ndagwurugwu Mizpa. Ya mere, o nweghị ọ bụladị otu onye iro a hapụrụ ndụ nʼagha ahụ.

9Joshua na ndị agha ya mere ha ihe Onyenwe anyị kwuru na a ga-eme ha. Ha gbupụrụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, surekwaa ụgbọ agha ha niile nʼọkụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.