16Ala ha gbatịrị site nʼAroea, na ndagwurugwu iyi Anọn, sitekwa nʼobodo dị nʼetiti ndagwurugwu ahụ na ala dị larịị gabiga gafee Medeba,
17ruo Heshbọn, na obodo ndị ọzọ dị nʼala larịị ahụ, tinyere obodo Dibọn, na Bamot Baal, na Bet-Baal-Meon,
18na Jahaz, na Kedemot, na Mefaat,
19na Kiriatem, na Sibma, na Zeret Shaha, nke dị nʼugwu nta dị na ndagwurugwu ahụ;
20na Bet-Peoa, na Bet-Jeshimọt, nke dị nʼebe dị na mgbada ugwu Pisga;