18na Jahaz, na Kedemot, na Mefaat,
19na Kiriatem, na Sibma, na Zeret Shaha, nke dị nʼugwu nta dị na ndagwurugwu ahụ;
20na Bet-Peoa, na Bet-Jeshimọt, nke dị nʼebe dị na mgbada ugwu Pisga;
21na obodo niile dị nʼala larịị ahụ, na ala Saịhọn niile, onye bụ eze ndị Amọrị nke chịrị na Heshbọn. Mosis lụgburu ya, lụgbukwaa ndịisi Midia bụ Evi, na nke Rekem, na nke Zua, na nke Hua, na nke Reba, ụmụ ndị eze ha na Saịhọn jikọtara aka buo agha.
22Tinyere ndị ha gburu nʼọgbọ agha, ụmụ Izrel ji mma agha gbuo Belam nwa Beoa, onye na-agba aja.