Joshua 13

“Ndị a bụ ala nke fọdụrụ unu ga-enweta: “ala ndị Filistia niile na ala ndị Geshua niile,

Joshua 13:2 (UKJV) This is the land that yet remains: all the borders of the Philistines, and all Geshuri,

1Nʼoge a, Joshua aghọọla agadi nwoke, Onyenwe anyị kpọrọ ya sị ya, “Ugbu a, ị ghọọla agadi, ụbọchị ọgwụgwụ ndụ gị abịala nso, ma ọtụtụ ala fọdụrụ ndị a ga-emeri.

2“Ndị a bụ ala nke fọdụrụ unu ga-enweta: “ala ndị Filistia niile na ala ndị Geshua niile,

3site nʼosimiri Shaịho dị nʼọnụ Ijipt ruo nʼoke ala Ekrọn, nʼakụkụ ugwu ya, nke a gụnyere ndị Kenan, na ndịisi ise ndị Filistia: ndị Gaza, ndị Ashdọd, ndị Ashkelọn, ndị Gat, na ndị Ekrọn; nakwa ala ndị Ava,

4site na ndịda ala ahụ niile dị nʼugwu; nʼala ndị Kenan, na Meara, nke bụ ala ndị Saịdọn, ruo nʼAfek, na oke ala ndị Amọrait;

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.