1Nʼoge a, Joshua aghọọla agadi nwoke, Onyenwe anyị kpọrọ ya sị ya, “Ugbu a, ị ghọọla agadi, ụbọchị ọgwụgwụ ndụ gị abịala nso, ma ọtụtụ ala fọdụrụ ndị a ga-emeri.
2“Ndị a bụ ala nke fọdụrụ unu ga-enweta: “ala ndị Filistia niile na ala ndị Geshua niile,
3site nʼosimiri Shaịho dị nʼọnụ Ijipt ruo nʼoke ala Ekrọn, nʼakụkụ ugwu ya, nke a gụnyere ndị Kenan, na ndịisi ise ndị Filistia: ndị Gaza, ndị Ashdọd, ndị Ashkelọn, ndị Gat, na ndị Ekrọn; nakwa ala ndị Ava,