Joshua 13

Ndị a bụ otu Mosis si keere ụmụ Izrel ala dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu obodo Jeriko.

Joshua 13:32 (UKJV) These are the countries which Moses did distribute for inheritance in the plains of Moab, on the other side Jordan, by Jericho, eastward.

30Ala ha ketara gbatịrị ruo Mahanaim. Ọ bụ ha nwekwa ala Bashan niile, na ala niile Ọg, eze Bashan, na-achị, tinyere iri obodo nta isii dị na Bashan, nke Jaịa wuru. Ha nwetakwara

31ọkara Gilead, na Ashtarọt, na Edrei bụ isi obodo alaeze Ọg nʼime Bashan. Ala ndị a niile ka e nyere ọkara ebo Manase, ya bụ ikwu niile e nwere site nʼụmụ Makia, ọkpara Manase.

32Ndị a bụ otu Mosis si keere ụmụ Izrel ala dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu obodo Jeriko.

33Ma Mosis enyeghị ebo Livayị ala ọbụla, nʼihi na ọ gwara ha na Onyenwe anyị, Chineke Izrel bụ ihe nketa ha nwere, dịka o kwere ha na nkwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.