28Obodo ndị a na obodo nta ndị ọzọ bụ ihe nketa ụmụ Gad dịka agbụrụ ha si dị.
29Mosis nyekwara ikwu ọbụla dị nʼọkara ebo Manase ala nke ha, dịka mkpa ha si dị.
30Ala ha ketara gbatịrị ruo Mahanaim. Ọ bụ ha nwekwa ala Bashan niile, na ala niile Ọg, eze Bashan, na-achị, tinyere iri obodo nta isii dị na Bashan, nke Jaịa wuru. Ha nwetakwara
31ọkara Gilead, na Ashtarọt, na Edrei bụ isi obodo alaeze Ọg nʼime Bashan. Ala ndị a niile ka e nyere ọkara ebo Manase, ya bụ ikwu niile e nwere site nʼụmụ Makia, ọkpara Manase.
32Ndị a bụ otu Mosis si keere ụmụ Izrel ala dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu obodo Jeriko.