26Na ala sitere Heshbọn ruo Ramat Mizpa, na Betonim, na sitekwa Mahanaim ruo oke ala Debịa.
27Nʼime ndagwurugwu ala ha bụ Bet-Haram, na Bet-Nimra, na Sukọt, na Zafọn, na ala fọdụrụ nʼalaeze Saịhọn eze Heshbọn, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan nʼoke ala ya ruokwa nsọtụ osimiri Galili.
28Obodo ndị a na obodo nta ndị ọzọ bụ ihe nketa ụmụ Gad dịka agbụrụ ha si dị.
29Mosis nyekwara ikwu ọbụla dị nʼọkara ebo Manase ala nke ha, dịka mkpa ha si dị.
30Ala ha ketara gbatịrị ruo Mahanaim. Ọ bụ ha nwekwa ala Bashan niile, na ala niile Ọg, eze Bashan, na-achị, tinyere iri obodo nta isii dị na Bashan, nke Jaịa wuru. Ha nwetakwara