1Otu a ka esi kenye ndị Izrel ala Kenan, bụ nke Elieza onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndị ndu ikwu niile dị nʼebo Izrel kere.
2Ebo ọbụla nʼime ebo itoolu na ọkara ahụ fọdụrụ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.
3Ma Mosis enyelarị ebo abụọ na ọkara ala nke ha nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. Ma o kenyeghị ndị Livayị ihe nketa ọbụla nʼetiti ha.