11O sikwara ebe ahụ ruo ndịda ugwu Ekrọn, tụgharịa ruo Shikerọn, gafee ya, ruo nʼugwu Baala, sitekwa nʼebe ahụ ruo Jabneel, oke ala ahụ kwụsịrị nʼosimiri.
12Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Ndị a bụ oke ala gbara ndị Juda gburugburu dịka ikwu ha niile si dị.
13Dịka iwu Onyenwe anyị nyere si dị, Joshua nyere Kaleb nwa Jefune oke nʼetiti ndị Juda. O kenyere ya Kiriat Aaba, ya bụ, Hebrọn. Aaba bụ nna nna Anak.
14Kaleb sitere nʼobodo Hebrọn chụpụ ndị ikom atọ, bụ Sheshai, na Ahiman, na Talmai, ụmụ Anak nʼala ha.
15O si nʼebe ahụ bilie ịlụso ndị bi na Debịa ọgụ. Nke a na-akpọ Kiriat Sefa nʼoge mbụ.