14Kaleb sitere nʼobodo Hebrọn chụpụ ndị ikom atọ, bụ Sheshai, na Ahiman, na Talmai, ụmụ Anak nʼala ha.
15O si nʼebe ahụ bilie ịlụso ndị bi na Debịa ọgụ. Nke a na-akpọ Kiriat Sefa nʼoge mbụ.
16Kaleb sịrị, “Nwoke ọbụla ga-aga busoo Kiriat Sefa agha ma merie ya ka m ga-akpọnye Aksa, bụ nwa m nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.”
17Ya mere, Otniel, nwa Kenaz, nwa nwanne Kaleb, lụgburu obodo ahụ nʼagha. Nʼihi nke a, Kaleb kpọnyere ya Aksa, bụ nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.
18Otu ụbọchị, mgbe Aksa bịakwutere Otniel, ọ kwagidere ya ka ọ rịọọ ala ubi site nʼaka nna ya. Mgbe Aksa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịdata, Kaleb jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị?”