Joshua 17

Nke a bụ oke e kenyere ndị ebo Manase, bụ ọkpara Josef, ya bụ Makia ọkpara Manase, onye bụ nna nna ndị Gilead. Onye natara ala Gilead na Bashan, nʼihi na ndị agbụrụ Makia bụ dike nʼagha.

Joshua 17:1 (UKJV) There was also a lot for the tribe of Manasseh; for he was the firstborn of Joseph; to know, for Machir the firstborn of Manasseh, the father of Gilead: because he was a man of war, therefore he had Gilead and Bashan.

1Nke a bụ oke e kenyere ndị ebo Manase, bụ ọkpara Josef, ya bụ Makia ọkpara Manase, onye bụ nna nna ndị Gilead. Onye natara ala Gilead na Bashan, nʼihi na ndị agbụrụ Makia bụ dike nʼagha.

2Ya mere, oke a dịịrị ndị fọdụrụ nʼebo Manase dịka ezinaụlọ ha si dị. Agbụrụ Abieza, Helek, Asriel, Shekem, Hefa na Shemida. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom agbụrụ Manase, nwa Josef, dịka ikwu ha si dị.

3Ma Zelofehad, nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, amụtaghị ụmụ ndị ikom kama ọ mụtara naanị ụmụ ndị inyom, ndị aha ha bụ nke a: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.