Joshua 17

Ma ụmụ ụmụ Josef sịrị Joshua, “Gịnị mere i ji nye anyị naanị otu ụzọ ala ka ọ bụrụ ihe nketa anyị? Ị hụrụ na Onyenwe anyị gọziri anyị mee ka ọnụọgụgụ anyị baa ụba.”

Joshua 17:14 (UKJV) And the children of Joseph spoke unto Joshua, saying, Why have you given me but one lot and one portion to inherit, seeing I am a great people, forasmuch as the LORD has blessed me until now?

12Ma ụmụ Manase enweghị ike ịchụpụ ndị Kenan bi nʼobodo ndị ahụ, nʼihi na ndị Kenan nọgidere bichie obodo ndị a.

13Ma nʼikpeazụ, mgbe ụmụ Izrel ghọrọ ndị dị ike, ha achụpụghị ndị Kenan niile bi nʼobodo ndị a kpamkpam, kama ha mere ka ha bụrụ ndị na-ejere ụmụ Izrel ozi, dịka ndị ohu ha.

14Ma ụmụ ụmụ Josef sịrị Joshua, “Gịnị mere i ji nye anyị naanị otu ụzọ ala ka ọ bụrụ ihe nketa anyị? Ị hụrụ na Onyenwe anyị gọziri anyị mee ka ọnụọgụgụ anyị baa ụba.”

15Joshua zara sị ha: “Ọ bụrụ na ala ugwu ugwu Ifrem agaghị ezuru unu nʼihi na unu bara ụba nʼọnụọgụgụ, gaanụ nʼoke ọhịa sụchasịa ala, nʼime ala ndị Periz, na nke ndị Refaim.”

16Ụmụ Josef zara Joshua sị, “Ala ugwu ugwu a agaghị ezuru anyị. Ọzọ, ndị Kenan niile bi nʼala dị larịị nwere ụgbọala igwe, ma ndị niile bi na Bet-Shan, na ụmụ obodo nta ha na ndị bikwa na Ndagwurugwu Jezril.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.