Joshua 17

Oke ala ụmụ Manase gbatịrị ga ndịda ruo na mmiri iyi Kana. Ụfọdụ obodo ndị Ifrem dị nʼebe ahụ, nʼetiti obodo ndị Manase, kama oke ala ndị Manase nʼakụkụ ugwu iyi ahụ kwụsịrị nʼosimiri Mediterenịa.

Joshua 17:9 (UKJV) And the coast descended unto the river Kanah, southward of the river: these cities of Ephraim are among the cities of Manasseh: the coast of Manasseh also was on the north side of the river, and the utmost limit of it were at the sea:

7Oke ala ebo Manase gbatịrị site nʼAsha ruo na Mikmetat, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Shekem. Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ndịda site nʼebe ahụ tinyere ndị bi nʼala En-Tapụọa.

8Ala dị gburugburu Tapụọa bụ ala ebo Manase, ma obodo Tapụọa nʼonwe ya, nke dị nʼoke ala ebo Manase, bụ obodo ebo Ifrem.

9Oke ala ụmụ Manase gbatịrị ga ndịda ruo na mmiri iyi Kana. Ụfọdụ obodo ndị Ifrem dị nʼebe ahụ, nʼetiti obodo ndị Manase, kama oke ala ndị Manase nʼakụkụ ugwu iyi ahụ kwụsịrị nʼosimiri Mediterenịa.

10Ala dị na ndịda bụ nke e kenyere Ifrem, ma ala mgbago ugwu bụ nke Manase. Ala ndị Manase gbatịrị ruo nʼosimiri Mediterenịa ma ha na ndị Asha nwekọrọ oke ala nʼakụkụ ugwu, ebe ha na ndị Isaka nwere oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.

11Manase ka e nyere obodo ndị a, nke dị nʼala e nyere Isaka na Asha: obodo Bet-Shan, na Ibleam, na Doa, na Endoa, na Teanak, na Megido, na obodo nta niile gbara ha gburugburu. Obodo nke atọ bụ Nafọt.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.