Joshua 18

Ndị mbụ e kenyere ala site nʼife nza bụ ebo Benjamin dịka ikwu ha si dị. Ala niile e kenyere ebo Benjamin bụ nke dị nʼetiti ala e nyere ebo Juda na Josef.

Joshua 18:11 (UKJV) And the lot of the tribe of the children of Benjamin came up according to their families: and the coast of their lot came forth between the children of Judah and the children of Joseph.

9Ndị ikom ahụ gabigara ala ahụ, depụta ya nʼakwụkwọ, nʼobodo nʼobodo dịka o si dị nʼoke asaa. Mgbe ha mesịrị nke a, ha lọghachikwutere Joshua nʼọmụma ụlọ ikwu nʼime Shaịlo.

10Joshua feere ha nza na Shaịlo nʼihu Onyenwe anyị, nʼebe ahụ ka ọ nọ keere ndị Izrel ala ahụ dịka ebo ha si dị.

11Ndị mbụ e kenyere ala site nʼife nza bụ ebo Benjamin dịka ikwu ha si dị. Ala niile e kenyere ebo Benjamin bụ nke dị nʼetiti ala e nyere ebo Juda na Josef.

12Oke ala ha nʼakụkụ ugwu sitere nʼosimiri Jọdan ruo nʼakụkụ ugwu Jeriko. Nʼọdịda anyanwụ o sitere na Jeriko ruo ala ugwu ugwu ahụ niile, ruokwa nʼọzara Bet-Aven.

13Oke ala ahụ sitekwara nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ Luz (ebe a na-akpọkwa Betel), ruokwa Atarọt-Ada, nke dị nʼakụkụ ndịda ugwu dị na mgbada Bet-Horon.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.