Joshua 19

Site nʼebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị gaa nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ruo Marala na Dabeshet, rukwaa iyi dị nʼihu Jokneam.

Joshua 19:11 (UKJV) And their border went up toward the sea, and Maralah, and reached to Dabbasheth, and reached to the river that is before Jokneam;

9E sitere nʼoke ụmụ Juda wepụta oke ụmụ Simiọn, nʼihi na ihe ụmụ Juda ketara dị ukwuu karịa ihe ha kwesiri iketa. Ọ bụ nke a mere ụmụ Simiọn ji nweta ihe nketa site nʼetiti ala ndị Juda.

10Ebo nke atọ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza bụ ebo Zebụlọn dịka ikwu ha si dị. Ala ha nwetara gbatịrị ruo Sarid.

11Site nʼebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị gaa nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ruo Marala na Dabeshet, rukwaa iyi dị nʼihu Jokneam.

12O si na Sarid chigharịa ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ahụ ruru nʼoke ala Kislọt Teboa, gbagorokwa ruo Daberat, ruokwa Jafia.

13Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo Gat Hefa, Et Kazin na Rimọn, tụgharịa nʼụzọ e si aga Nea.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.