Joshua 19

Nʼebe ahụ, ọ gara gburugburu nʼakụkụ ugwu ruo Hanatọn, ruokwa na Ndagwurugwu Ifta El ebe ọ sọtụrụ.

Joshua 19:14 (UKJV) And the border compasses it on the north side to Hannathon: and the utmost limit thereof are in the valley of Jiphthahel:

12O si na Sarid chigharịa ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ahụ ruru nʼoke ala Kislọt Teboa, gbagorokwa ruo Daberat, ruokwa Jafia.

13Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo Gat Hefa, Et Kazin na Rimọn, tụgharịa nʼụzọ e si aga Nea.

14Nʼebe ahụ, ọ gara gburugburu nʼakụkụ ugwu ruo Hanatọn, ruokwa na Ndagwurugwu Ifta El ebe ọ sọtụrụ.

15Obodo ndị a niile dịkwa nʼime ihe nketa ụmụ Zebụlọn: Katat, Nahalal, Shịmrọn, Idala na Betlehem. Obodo niile ndị a dị iri na abụọ, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.

16Obodo ndị a niile na obodo nta ha, so nʼala ụmụ Zebụlọn nwetara dịka ihe nketa ha, dịka ikwu ha si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.