25Ala na obodo ha ketara bụ ndị a: Helkat, Hali, Beten, Akshaf,
26Alamelek, Amad na Mishal. Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ gbatịrị ruo Kamel na Shihoa-Libnat.
27O sitere nʼebe ahụ tụgharịa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ gawa Bet-Dagọn, ma ruokwa Zebụlọn na Ndagwurugwu Ifta El, ma gbagoro ruokwa Bet-Emek na Neiel. O sikwa nʼebe ahụ gafee, ruo Kabul, nʼakụkụ aka ekpe.
28Ọ gara ruo Ebrọn, Rehob, Hamọn na Kana, ruokwa ebe obodo Saịdọn gbasapụrụ.
29Oke ala ahụ mere dịka ọ na-alaghachi azụ bịaruo Rema, ruokwa obodo e wusiri ike bụ Taịa, tụgharịakwa gawa Hosa pụta nʼọnụ mmiri osimiri Mediterenịa nke dị nʼakụkụ Akzib