Joshua 19

tinyekwara obodo nta ndị ọzọ niile gbara obodo ukwu ndị a gburugburu, ruo obodo Baalat-Bịa, ya bụ (obodo Rema dị na Negev). Nke a bụ ihe nketa ebo Simiọn dịka ikwu ha si dị.

Joshua 19:8 (UKJV) And all the villages that were round about these cities to Baalathbeer, Ramath of the south. This is the inheritance of the tribe of the children of Simeon according to their families.

6Bet-Lebaot na Sharuhen, obodo iri na atọ na obodo nta ndị ọzọ gbara ha gburugburu.

7Na Ain, Rimọn, Eta na Ashan, obodo anọ na obodo nta ha,

8tinyekwara obodo nta ndị ọzọ niile gbara obodo ukwu ndị a gburugburu, ruo obodo Baalat-Bịa, ya bụ (obodo Rema dị na Negev). Nke a bụ ihe nketa ebo Simiọn dịka ikwu ha si dị.

9E sitere nʼoke ụmụ Juda wepụta oke ụmụ Simiọn, nʼihi na ihe ụmụ Juda ketara dị ukwuu karịa ihe ha kwesiri iketa. Ọ bụ nke a mere ụmụ Simiọn ji nweta ihe nketa site nʼetiti ala ndị Juda.

10Ebo nke atọ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza bụ ebo Zebụlọn dịka ikwu ha si dị. Ala ha nwetara gbatịrị ruo Sarid.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.