11E kenyere ha obodo Kiriat Aaba, nke a na-akpọkwa Hebrọn. Obodo a dị nʼala ugwu ugwu Juda, ya na ala gbara ya gburugburu ka ọ bụrụ ebe ịta nri anụ ụlọ. (Aaba bụ nna nna ndị Anak.)
12Ma eburularị ụzọ nye Kaleb nwa Jefune obodo ukwu na obodo nta niile, na ala ubi niile dị nʼakụkụ ya ka ọ bụrụ ihe nketa ya.
13Ya mere, ụmụ ụmụ Erọn, onye nchụaja, ka e kenyere obodo Hebrọn, nke bụkwa obodo mgbaba, kenyekwa ha obodo ndị a: Libna,
14Jatịa, Eshtemoa,
15Họlọn, Debịa,