28Ebo Isaka nyere ha obodo anọ. Obodo ndị a bụ, Kishiọn, Daberat,
29Jamut na En-Ganim, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, obodo anọ.
30Ebo Asha nyekwara ha obodo anọ. Ha bụ, Mishal, Abdon,
31Helkat na Rehob, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, obodo anọ.
32Ebo Naftalị nyere ha obodo atọ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. Obodo ndị a bụ, Kedesh, nʼime Galili, nke bụkwa obodo mgbaba, Hamot Doa na Katan.