37Kedemot, Mefaat na ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ kpaa nri.
38Ebo Gad nyere ha obodo anọ. Obodo ndị a bụ, Ramọt, nʼime Gilead nke bụ obodo mgbaba, Mahanaim,
39Heshbọn na Jeza, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.
40Ọnụọgụgụ obodo niile e kenyere agbụrụ Merari bụ obodo iri na abụọ, ha bụ ndị fọdụrụ na ndị Livayị.
41Ọnụọgụgụ obodo niile na ebe ịta nri nke anụ ụlọ e sitere nʼala ụmụ Izrel nye ndị Livayị dị iri anọ na asatọ.