Joshua 21

Ọnụọgụgụ obodo niile na ebe ịta nri nke anụ ụlọ e sitere nʼala ụmụ Izrel nye ndị Livayị dị iri anọ na asatọ.

Joshua 21:41 (UKJV) All the cities of the Levites within the possession of the children of Israel were forty and eight cities with their suburbs.

39Heshbọn na Jeza, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.

40Ọnụọgụgụ obodo niile e kenyere agbụrụ Merari bụ obodo iri na abụọ, ha bụ ndị fọdụrụ na ndị Livayị.

41Ọnụọgụgụ obodo niile na ebe ịta nri nke anụ ụlọ e sitere nʼala ụmụ Izrel nye ndị Livayị dị iri anọ na asatọ.

42Obodo ọbụla nwere ala gbara ya gburugburu ebe anụ ụlọ ga-anọ kpaa nri.

43Ya mere, Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel ala ahụ ọ ṅụrụ iyi inye ndị nna nna ha. Ha nwetara ya, biri nʼime ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.