Joshua 21

Obodo ọbụla nwere ala gbara ya gburugburu ebe anụ ụlọ ga-anọ kpaa nri.

Joshua 21:42 (UKJV) These cities were every one with their suburbs round about them: thus were all these cities.

40Ọnụọgụgụ obodo niile e kenyere agbụrụ Merari bụ obodo iri na abụọ, ha bụ ndị fọdụrụ na ndị Livayị.

41Ọnụọgụgụ obodo niile na ebe ịta nri nke anụ ụlọ e sitere nʼala ụmụ Izrel nye ndị Livayị dị iri anọ na asatọ.

42Obodo ọbụla nwere ala gbara ya gburugburu ebe anụ ụlọ ga-anọ kpaa nri.

43Ya mere, Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel ala ahụ ọ ṅụrụ iyi inye ndị nna nna ha. Ha nwetara ya, biri nʼime ya.

44Onyenwe anyị nyere ha izuike nʼakụkụ niile, dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye ndị nna nna ha. Ọ dịkwaghị otu nʼime ndị iro ha ọbụla guzogidere ha, nʼihi na Onyenwe anyị nyefere ndị iro ha niile nʼaka ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.